Nnaji Chinonso Precious
LOVING, CARING, FORGIVING, TEACHABLE, INTRESTING TO BE WITH, CREATIVE ,AND GOD FEARING🙏🥳🥰
08/08/2026
JỌN 14:6 (IGB)
Jisus si ya, Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.
08/08/2026
ABÙ ỌMA 14:1-4 (IGB)
1 Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù Ọma nke Devid. Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe.
2 Jehova siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya, Ihu ma ọ di onye nwere uche, Nke nāchọ Chineke.
3 Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.
4 Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amaghi ihe? Bú ndi riworo nri site na-iri ndi m, Ma ha akpọkughi Jehova.
08/08/2026
I JỌN 4:8 (IGB)
Onye nādighi-ahu n'anya amaghi Chineke; n'ihi na Chineke bu ihu-n'anya.
08/08/2026
EKLISIASTIS 3:14 (IGB)
Amawom na ihe ọ bula Chineke nēme, nke ahu gādiru mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi ihe agātukwasi ya, ọ dighi kwa ihe agēbìlata nime ya: Chineke emewo kwa ya, ka madu we tua egwu n'iru Ya.
08/08/2026
ABÙ ỌMA 27:10 (IGB)
N'ihi na nnam na nnem arapuwom, Ma Jehova gēkubatam.
08/08/2026
JOSHUA 1:9 (IGB)
Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.
08/08/2026
ILU 27:10 (IGB)
Arapula eyì-gi na eyì nna-gi; Abà-kwa-la n'ulo nwa-nne-gi n'ubọchi nhuju-anya-gi: Ọ di nma, bú ab͕ata-obi nke nọ nso, Kari nwa-nne nke nọ n'ebe di anya.
08/08/2026
ILU 18:24 (IGB)
Onye nēnwe ọtutu eyì nēnwe ha ibibi onwe-ya: Ma onye nāhu n'anya di nārapara n'aru kari nwa-nne.
08/08/2026
ABÙ ỌMA 55:12-14 (IGB)
12 N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta; M'gānagide kwa ya: Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem; M'gēzonari kwa ya onwem:
13 K**a ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra, Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.
14 Ayi nāb͕akọri ìzù utọ, N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.
Click here to claim your Sponsored Listing.
Contact the business
Telephone
Website
Address
Enugu